Daniel
isiakwụkwọ 6:15-21
Bible Nso
15Mb͕e ahu ndikom ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ha we si eze, Mara, gi eze, na iwu nke diri Midia na Peasia bu, na ọ dighi isọ-nsọ ọ bula ma-ọbu ukpuru ọ bula nke eze nēme ka o guzosie ike agāb͕anwe.
16Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.
17Ewe bute otù nkume, tukwasi ya n'ọnu olùlù ahu; eze we were nb͕a-aka-akàrà-ya na nb͕a-aka-akàrà ndi-isi-ya ka ya; ka ewe ghara ib͕anwe ihe ezubere bayere Daniel.
18Mb͕e ahu eze lara n'ulo uku ya, nọ ọnọdu-abali nēbu ọnu: achibatakwaghi ubọ egwú n'iru ya: ura-ya fepu-kwa-ra n'anya-ya.
19Mb͕e ahu eze biliri n'isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum.
20Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n'ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n'aka ọdum?
21Mb͕e ahu Daniel gwara eze okwu, si, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.