Daniel 6:4-10 IGBOB

4 Mb͕e ahu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze nọ nāchọ ichọputa ihe-ebubo iji bo Daniel bayere ala-eze; ma ọ dighi ihe-ebubo maọbu omume bibiri ebibi ọ bula ha puru ichọputa; n'ihi na onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu, ọ dighi kwa nmehie ma-ọbu omume bibiri ebibi ọ bula achọputara n'aru ya.

5 Mb͕e ahu ndikom ndia nāsi, Ayi agaghi-achọputa ihe-ebubo iji bo Daniel nka, ma isi na ayi achọputaghi ya n'aru ya n'iwu nke Chineke-ya.

6 Mb͕e ahu ndi-isi ndia na ndi nọchiri anya eze ndia were oké nkpọtu b͕akọta n'ebe eze nọ, ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Daraiọs, bú eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

7 Ndi-isi ala-eze nile, na ndi-isi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi-ndum-ọdu, na ndi nāchi achi, ab͕awo ìzù ime ka otù ukpuru eze guzosie ike, na ime ka otù isọ-nsọ di ike, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum.

8 Ub͕u a, eze, me ka isọ-nsọ a guzosie ike, kaye aha-gi n'ihe a edere n'akwukwọ, ka ewe ghara ib͕anwe ya, dika iwu nke Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.

9 N'ihi nka ka eze, bú Daraiọs, kayere aha-ya n'ihe ahu edere n'akwukwọ, na n'isọ-nsọ ahu.

10 Ma Daniel, mb͕e ọ mara na akayewo aha n'ihe ahu edere n'akwukwọ, o we bata n'ulo-ya: (ma o nwere window ufọdu ghere oghe n'ime-ulo-elu-ya chere iru na Jerusalem;) ọ bu kwa ub͕ò atọ n'ubọchi ka ya onwe-ya nēb͕u ikperè-ya n'ala nēkpe ekpere, nēkele ekele n'iru Chineke-ya, n'ihi na otú a ka ọ nēmeri site na mb͕e gara aga.