Daniel
isiakwụkwọ 8:18-24
Bible Nso
18Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.
19O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.
20Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.
21Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.
22Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.
23Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.
24Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.