Emos
isiakwụkwọ 3:1-4
Bible Nso
1Nurunu okwu a nke Jehova kwuworo megide unu, umu Israel, megide ab͕uru ahu nile nke M'mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, si,
2Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.
3Màdu abua gāyikọta je ije, ma ọ buru na ha ezuteghi?
4Ọdum, ọ̀ gāb͕ọ uja n'oké ọhia, mb͕e ọ dighi anu ọ nādọb͕u? nwa-ọdum, ọ̀ gēme ka olu-ya si n'ebe-obibi-ya da, ma ọ buru na o nwudeghi ihe?