8 Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M'gaje ido opù eji atù nb͕idi n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ:
9 ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.
10 Amazaia, bú onye-nchu-àjà Bet-el, we zigara Jeroboam, bú eze Israel, ozi, si, Emos ekekọtawo madu imegide gi n'etiti ulo Israel: ala apughi inagide okwu-ya nile.
11 N'ihi na otú a ka Emos siri, Site na mma-agha ka Jeroboam gānwu, aghaghi ime kwa ka Israel si n'ala-ya je biri n'ala ọzọ.
12 Amazaia we si Emos, Gi onye-ọhu-uzọ, je b͕alaga n'ala Juda, rie nri n'ebe ahu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēbu amuma:
13 ma ebu-kwa-la amuma ọzọ nime Bet-el: n'ihi na ebe nsọ nke eze ka ọ bu; ọzọ, ulo ala-eze ka ọ bu.
14 Emos we za, si Amazaia, Ọ dighi onye-amuma m'bu, ọ dighi kwa nwa onye-amuma m'bu; kama onye-nche-ehi ka m'bu, ya na onye nēdozi nkpuru osisi sycomore: