1 Ma ndia bu ndi-nchu-aja na ndi Livai ndi soro Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua, rigota: Seraia, na Jeremaia, na Ezra;
2 na Amaria, na Maluk, na Hatush;
3 na Shekania, na Rehum, na Meremot;
4 na Ido, na Ginetoi, na Abaija;
5 na Mijamin, na Maadia, na Bilga;
6 na Shemaia, na Joiarib, na Jedaia;
7 na Salu, na Amok, na Hilkaia, na Jedaia. Ndia bu ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na umu-nne-ha n'ubọchi Jeshua.