Nehemaia 1 IGBOB

1 Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n'ọnwa Kislev, n'arọ nke-orú, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze.

2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ndikom ufọdu ndi sitere na Juda; m'we jua ha ajuju bayere ndi-Ju, bú ndi-nb͕apu, nke fọduru site na ndọta-n'agha, na ajuju bayere Jerusalem.

3 Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.

4 O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe,

5 si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:

6 biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.

7 Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu.

8 Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile:

9 ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.

10 Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.

11 Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n'aru ya n'iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13