Nehemaia 9 IGBOB

1 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nka achikọtara umu Israel n'obubu-ọnu, na n'ákwà-nke, ájá dikwasi kwa ha.

2 Nkupuru Israel we kewaputa onwe-ha n'aru ndi ala ọzọ nile, guzo, kwuputa nmehie nile ha, na ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha.

3 Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.

4 Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.

5 Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.

6 Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.

7 Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham;

8 I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu.

9 I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie;

10 I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile, na n'aru ndi nile nke ala-ya; n'ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta.

11 I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.

12 Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.

13 Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu:

14 I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi:

15 ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha.

16 Ma ndi ahu na nna-ayi-hà mere ihe na nganga, kwesie olu-ha ike, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu,

17 ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.

18 Ọbuná mb͕e ha mere nwa-ehi awuru awu nye onwe-ha, si, Nka bu chi-gi nke mere ka i si n'Ijipt rigoputa, ha we me oké ihe-nlelì-anya;

19 ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.

20 I nye-kwa-ra ezi Mọ nke Gi ime ka ha nwe uche, I b͕ochighi kwa manna-Gi n'ọnu-ha, I nye-kwa-ra ha miri bayere akpiri-ikpọ-nku-ha.

21 Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.

22 Ọzọ, I nyere ha ala-eze na ndi di iche iche, we kè ha n'òkè n'òkè n'akuku nile: ha we nweta ala Saihon, bú ala nke eze Heshbon, na ala Og, bú eze Beshan.

23 I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n'ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.

24 Umu-ha we ba, nweta ala ahu, I we ruru ndi bi n'ala ahu, bú ndi Kenean, ala n'iru ha, were ha, na ndi-eze-ha, na ndi di iche iche nke ala ahu, nye n'aka-ha, ka ha were ha me dika ọ tọrọ ha utọ

25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.

26 Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.

27 I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.

28 Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n'iru Gi ọzọ: I we rapu ha n'aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n'aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di,

29 I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n'iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha,) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa.

30 Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.

31 Ma n'ọtutu obi-ebere-Gi I meghi ka ha gwusia, I rapughi kwa ha; n'ihi na Chineke Nke nēme amara, Nke nwe kwa ra obi-ebere, ka I bu.

32 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.

33 Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n'ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:

34 ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.

35 Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia.

36 Le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù ta, ma ala ahu nke I nyere nna-ayi-hà iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya, le, ayi onwe-ayi bu ndi-orù nime ya.

37 Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.

38 Ma n'ihi ihe a nile ka ayi onwe-ayi nēme ọb͕ub͕a-ndu kwesiri ntukwasi-obi, ayi nēde kwa ya n'akwukwọ; ndi-isi-ayi na ndi Livai ayi na ndi-nchu-àjà-ayi bu kwa ndi-isi n'ikà ihe ahu akara akàrà.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13