Nehemaia 13 IGBOB

1 N'ubọchi ahu ka ha guru n'akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi;

2 n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.

3 O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n'Israel.

4 Ma tutu ihe a eme, Elaiashib, bú onye-nchu-àjà, onye edoro onye-isi ime-ulo nke ulo Chineke-ayi, ebe ọ bu ọgọ Tobaia,

5 ọ we doziere ya ime-ulo uku, ma n'ebe ahu ka ha nētiye na mb͕e gara aga onyinye-inata-iru-ọma, na frankincense, na ihe ulo Chineke nile, na otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu, bú ihe enyere n'iwu nke ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama; na àjà-nbuli nke ndi-nchu-aja.

6 Ma na mb͕e a nile anọghm na Jerusalem; n'ihi na n'arọ nke-orú-na-iri-na-abua nke Atakasakses, bú eze Babilon, ka m'biakutere eze, ma n'ọgwugwu ubọchi ufọdu ariọrọm eze ka ọ rapum:

7 m'we biarue Jerusalem, ghọta ihe ọjọ ahu nke Elaiashib mere bayere Tobaia, n'idoziri ya ime-ulo n'ogige ulo Chineke.

8 O we dim njọ nke-uku: m'we si n'ime-ulo ahu tupu ihe nile nke ulo Tobaia n'èzí.

9 M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.

10 M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya.

11 Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M'we chikọta ha, guzo ha n'ebe-nguzo-ha.

12 Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.

13 M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.

14 Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.

15 Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.

16 Ndi Taia bi-kwa-ra nime ya, ndi nēwebata azù, na ihe nile ọ bula anēre ere, ha nērenye kwa ha umu Juda n'ubọchi-izu-ike, na nime Jerusalem.

17 Mu na ndi amara aha-ha nime Juda we se okwu, m'we si ha, Gini bu ihe ọjọ a nke unu onwe-unu nēme, nēme kwa ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ?

18 Ọ̀ bughi otú a ka nna-unu-hà mere, Chineke-ayi we me ka ihe ọjọ a nile biakwasi ayi, biakwasi kwa obodo a? ma unu onwe-unu nātukwasi ihe n'ihe di ọku di n'aru Israel, n'ime ubọchi-izu-ike ka ọ ghara idi nsọ.

19 O rue, mb͕e ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem nāb͕a ọchichiri tutu ubọchi-izu-ike erue, na asirim ka emechie uzọ nile, m'si kwa ka aghara imeghe ha rue mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri: m'we guzo ufọdu nime ndi nējerem ozi n'ọnu-uzọ-ama, ka aghara ibubata ibu nime n'ubọchi-izu-ike.

20 Ndi nāzu ahia na ndi nēre ihe ọ bula nke anēre ere we nọ ọnọdu-abali n'azu Jerusalem otù ub͕ò ma-ọbu ub͕ò abua.

21 M'we b͕a àmà megide ha, si ha, Gini mere unu onwe-unu nānọ ọnọdu-abali na ncherita-iru mb͕idi? ọ buru na unu eme ya ọzọ, m'gēseti aka megide unu. Site na mb͕e ahu ha abiaghi n'ubọchi-izu-ike.

22 M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.

23 Ọzọ, na mb͕e ahu ka m'huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab:

24 umu-ha we nēkwu okwu nkera n'asusu Ashdod, ha amataghi kwa ikwu okwu n'asusu ndi-Ju, kama dika asusu uzọ ndi abua ahu si di.

25 Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.

26 Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.

27 Ọ̀ bu kwa unu ka ayi gēge nti ime ihe ọjọ uku a nile, imekpu emekpu megide Chineke-ayi n'iluta ndinyom ala ọzọ?

28 Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.

29 Chinekem, cheta ha, n'ihi na ha emewo ka agua ọlu-nchu-àjà, na ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà, na nke ndi Livai, n'ihe nādighi nsọ.

30 Eme-kwa-ram ka ha puta n'ebe onye ala ọzọ ọ bula nọ di ọcha, m'we guzoro ndi-nchu-àjà, guzo-kwa-ra ndi Livai, ihe-ndebe, nwoke ọ bula n'ije-ozi-ya;

31 na inara onyinye iji biaru nso, bú nkú, na mb͕e ezubere, na inara nkpuru mbu. Chinekem, chetam, imerem ezi ihe.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13