Nehemaia 8 IGBOB

1 Ndi ahu nile we chikọta onwe-ha dika otù onye rue amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri; ha we si Ezra, bú ode-akwukwọ, ka o weta akwukwọ iwu Moses, nke Jehova nyere Israel n'iwu.

2 Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa.

3 O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu.

4 Ezra, bú ode-akwukwọ, we guzo n'elu ulo-elu osisi, nke ha mere bayere ihe a; Matitaia, na Shema, na Anaia, na Uraia, na Hilkaia, na Maaseia, we guzo n'akuku ya, n'aka-nri-ya; Pedaia kwa, na Mishael, na Malkija, na Hashum, na Hashbadana, na Zekaraia, na Meshulam, n'aka-ekpe-ya.

5 Ezra we saghe akwukwọ n'anya ndi ahu nile; (n'ihi na ọ nọ n'elu n'ebe ndi ahu nile nọ;) ma mb͕e ọ saghere ya, ndi ahu nile guzoro:

6 Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala.

7 Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha.

8 Ha wee gua n'akwukwọ ahu, bú n'iwu Chineke, guputa ya nke-ọma, we me ka amata isi-ya, ha we ghọta ọgugu-ya.

9 Nehemaia, nke ya onwe-ya bu Tiashata, na Ezra onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ, na ndi Livai, bú ndi nēzí ndi ahu ihe, we si ndi ahu nile, Ta, ihe nsọ nke diri Jehova, bú Chineke-unu, ka ọ bu; unu erula újú, akwa-kwa-la ákwá. N'ihi na ndi ahu nile nākwa ákwá, mb͕e ha nuru okwu nile nke iwu ahu.

10 O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.

11 Ndi Livai we nēme ka ndi ahu nile b͕a nkiti, si, Nọdunu du, n'ihi na ubọchi a di nsọ, ihe ewuta-kwa-la unu.

12 Ndi ahu nile we je iri ihe, na iṅu ihe ọṅuṅu, na iziga òkè, na ime ka oké ọṅù di, n'ihi na ha ghọtara okwu nile nke emere ka ha mara.

13 Ma n'ubọchi nke-abua achikọtara ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi ahu nile, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, n'ebe Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ, ọbuná inwe uche bayere okwu nile nke iwu ahu.

14 Ha we chọputa ihe a edeworo n'iwu, bú na Jehova nyere iwu site n'aka Moses, ka umu Israel nọdu n'ulo-ntu n'ememe di n'ọnwa nke-asa:

15 na ka eme ka anu ka ekwusa kwa n'obodo-ha nile na nime Jerusalem, si, Puanu je n'ugwu, chita akwukwọ osisi olive, na akwukwọ osisi nēnye manu, na akwukwọ osisi myrtle, na igu nkwu, na akwukwọ nke osisi b͕ara n'ọhia, ime ulo-ntu, dika edeworo ya n'akwukwọ.

16 Ndi ahu we je, chita ha, mere onwe-ha ulo-ntu, nwoke ọ bula n'elu-ulo-ya, na n'ogige nile ha, na n'ogige nile nke ulo Chineke, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama miri, na n'amá nke ọnu-uzọ-ama Efraim.

17 Nkpọkọta ahu nile nke ndi nālata site na ndọta-n'agha ahu mere ulo-ntu, we nọdu n'ulo-ntu-ha: n'ihi na umu Israel emeghi otú a site n'ubọchi Jeshua nwa Nun rue ubọchi ahu. Oké ọṅù di uku we di.

18 O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13