7 M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi inye ndi nāchi ala n'ofè osimiri, ka ha kwe ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda;
8 na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.
9 M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.
10 Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.
11 M'we bata Jerusalem, nọ n'ebe ahu ubọchi atọ.
12 M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n'obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n'ebe m'nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m'nānọkwasi ya.
13 M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.