1 O rue, mb͕e Sanbalat, na Tobaia, na Geshem, bú onye Arebia, na ndi-iro-ayi fọduru, nuru na m'lusiri mb͕idi ahu, na ọ dighi kwa ntipú fọduru nime ya; (ọ bu ezie na akaghm-eguzo ibo-ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ-ama nile rue mb͕e ahu;)
2 o rue, na Sanbalat na Geshem ziterem ozi, si, Bia, ka ayi zukọta n'otù n'obodo ntà nime ndagwurugwu nke Ono. Ma ndi ahu nēchè èchìchè imejọm emejọ.
3 M'we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m'nēje, apughkwam irida: n'ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m'nārapu ya, we ridakuru unu?
4 Ha we ziterem ozi ub͕ò anọ dika okwu a si di; m'we zaghachi ha okwu dika okwu a si di.
5 Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya;
6 edewo nime ya, si, Anuwo ya n'etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n'ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di.