6 Ndia bu umu ala ahu anāchi achi, ndi nārigo, bú ndi sitere na ndọta-n'agha ahu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi Nebukadneza, bú eze Babilon, mere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha we lata na Jerusalem, lata kwa na Juda, nwoke ọ bula n'obodo-ya;
7 ndi nābia, ha na Zerubabel, na Jeshua, na Nehemaia, na Azaraia, na Raamia, na Nahamani, na Mọdekai, na Bilshan, na Misperet, na Bigvai, na Nehum, na Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:
8 Umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.
9 Umu Shefataia ọgu iri-na-asatọ na iri na abua.
10 Umu Ara, nnù na ọgu iri-na-abua na iri na abua.
11 Umu Pahat-moab, nke umu Jeshua na Joab, nnù asa na iri na asatọ.
12 Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.