65 Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.
66 Nkpọkọta ahu nile n'otù di orú nnù uzọ ise na nnù ise na ọgu iri-na-asatọ,
67 nāgughi orù-ha ndikom na orù-ha ndinyom, ndi di nnù iri-na-asatọ na ọgu isi na iri na asa: ha nwe-kwa-ra ọgu madu iri-na-abua na ise bu ndikom nābù abù na ndinyom nābù abù.
68 Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;
69 camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.
70 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna nyere onyinye nke diri ije-ozi ahu. Tiashata tiyere n'ulo-àkù nnù daric ọla-edo abua na ọgu iri, na ọgu ọkwa-nwusa abua na iri, na nnù uwe ndi-nchu-àjà na ọgu isi na iri.
71 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ abua na nnù iri, na nnù pound ọla-ọcha ise na ọgu iri.