2 Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.
3 Ọ gēru kwa, mb͕e onye ọ bula gēbu kwa amuma ọzọ, na nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāsi ya, I gaghi-adi ndu; n'ihi na okwu-ugha ka i kwuworo n'aha Jehova: nna-ya na nne-ya ndi muru ya gāmapú ya mb͕e o nēbu amuma.
4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ihere gēme ndi-amuma, onye ọ bula n'ọhù-ya, mb͕e o nēbu amuma; ha agaghi-eyiri kwa uwe-nwuda nke aji-anu ka ha we ghọ aghughọ:
5 ma ọ gāsi, Ọ dighi onye-amuma m'bu, onye-ọlu-ubi ka m'bu; n'ihi na madu mere ka ab͕atam site na mb͕e m'di na nwata.
6 Agāsi kwa ya, Gini bu ntiputa-ọnyá ndia n'etiti aka-gi abua? Ọ gāsi kwa, Ha bu ọnyá etiputaram n'ulo ndi nāhum n'anya.
7 Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.
8 Ọ gēru kwa, n'ala nka nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na uzọ abua nime ya ka agēbipu, ha kubìe ume; ma uzọ nke-atọ gāfọdu nime ya.