14 Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.
15 Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n'ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.
16 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu.
17 Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.
18 Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n'aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?
19 Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu.
20 N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà.