26 N'ihi na lenu ọkpukpọ-unu, umu-nnam, na ọ dighi ọtutu ndi mara ihe dika anu-aru si mara ihe, ọ dighi ọtutu ndi-ike, ọ dighi ọtutu ndi amazuru aha-ha, ka akpọrọ:
27 Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;
28 ọ bu kwa ihe di ala nke uwa, na ihe akpọrọ ihe-efu, ka Chineke rọputara, bú ihe nke nādighi, ka O we me ka ihe nke nādi ghara idi irè:
29 ka anu-aru nile, bú madu, we ghara inya isi n'iru Chineke.
30 Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:
31 ka, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.