4 ha nile ṅu-kwa-ra otù ihe-ọṅuṅu ahu nke mọ: n'ihi na ha nāṅu miri nke si na nkume nke mọ nke soro ha: nkume ahu bu kwa Kraist.
5 Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia.
6 Ma ihe ndia ghọrọ ihe-atù nye ayi, ka ayi we ghara ibu ndi agu ihe ọjọ nāgu, dika agu ihe ọjọ gu-kwa-ra ndi ahu.
7 Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.
8 Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri.
9 Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì.
10 Unu atamu-kwa-la, dika ufọdu n'etiti ha tamuru, onye-nbibi ahu we la ha n'iyì.