10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.
11 N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.
12 Ma ayi onwe-ayi anataghi mọ nke uwa, kama ọ bu Mọ Nke sitere na Chineke; ka ayi we mata ihe nile Chineke were amara nye ayi.
13 Ọ bu kwa ihe ndia ka ayi nēkwu, ọ bughi n'okwu nke amam-ihe madu nēzí, kama n'okwu nke Mọ Nsọ nēzí; ayi nēwere kwa ihe nke Mọ Nsọ tule ihe nke Mọ Nsọ.
14 Ma madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adighi-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n'ihi na ha bu ihe-nzuzu n'anya-ya; ọ pughi kwa imara ha, n'ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha.
15 Ma onye Mọ Nsọ nāchi nēsikwuputa ihe nile, ma ọ dighi onye ọ bula nēsikwuputa ya onwe-ya.
16 N'ihi na ònye mara uche Onye-nwe-ayi, ka o zí Ya ihe? Ma ayi onwe-ayi nwere uche nke Kraist.