5 ka okwukwe-unu we ghara idi n'amam-ihe madu, kama n'ike nke Chineke.
6 Otú ọ di, amam-ihe bu ihe ayi nēkwu n'etiti ndi tozuru okè: ma ọ bu amam-ihe nke nābughi nke oge a, ọ bughi kwa nke ndi-isi oge a, ndi anēme ka ha ghara idi irè:
7 kama ihe ayi nēkwu bu amam-ihe Chineke n'ihe-omimi, bú amam-ihe nke ezobeworo, nke Chineke buru uzọ ka àkà mb͕e oge ndia akērughi, iwetara ayi otuto:
8 nke ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-isi oge a mara: n'ihi na asi na ha mara ya-ri, ha agaghi-akpọgidewori Onye-nwe ebube n'obe:
9 kama dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ihe anya nāhughi, nke nti nānughi kwa,Nke nābàghi kwa n'obi madu,Ka ha ra, bú ihe Chineke doziri ndi huru Ya n'anya.
10 Ma ọ bu ayi onwe-ayi ka Chineke kpughere ha site n'aka Mọ Nsọ: n'ihi na Mọ Nsọ nēnyocha ihe nile, ọbuná ihe nile di omimi nke Chineke.
11 N'ihi na ònye n'etiti madu matara ihe nile nke madu, ma-ọbughi mọ nke madu ahu, nke di nime ya? ọbuná otú a ọ dighi onye mara ihe nke Chineke, ma-ọbughi Mọ nke Chineke.