15 Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku.
16 Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?
17 Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.
18 Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.
19 N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:
20 ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu.
21 Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu;