14 N'ihi na edowo di nēkweghi ekwe nsọ nime nwunye-ya, edowo kwa nwunye nēkweghi ekwe nsọ nime nwa-nna-ayi nwoke: n'ihi na, ma ọ dighi otú a, umu-unu gābu umu nādighi ọcha; ma otú ọ di, ha di nsọ.
15 Ma ọ buru na onye ahu nke nēkweghi ekwe ekewapu onwe-ya, ya kewapu onwe-ya: emeghi ka nwa-nna-ayi nwoke ma-ọbu nwa-nna-ayi nwanyi buru orù n'okwu di otú a: ma Chineke akpọwo ayi n'udo.
16 N'ihi na ì si aṅa mara, nwunye, ma i gāzọputa di-gi? ma-ọbu ì si aṅa mara, di, ma i gāzọputa nwunye-gi.
17 Ọ bu nání, dika Onye-nwe-ayi kèworo nye onye ọ bula, dika Chineke kpọworo onye ọ bula, ya jegharia otú a. Otú a ka m'nāka kwa àkà nime nzukọ Kraist nile.
18 Àkpọrọ onye ọ bula mb͕e ebìsiri ya úgwù? ya ghara ighọ onye anēbìghi úgwù. Àkpọworo onye ọ bula n'ebìghi-úgwù? ya ghara ikwe ka ebì ya úgwù.
19 Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu.
20 Onye ọ bula, nime ọkpukpọ ahu eji kpọ ya, ya nọgide n'ọkpukpọ ahu.