6 Ma anamekwu nka n'uzọ nkweye, ọ bughi n'uzọ ihe enyere n'iwu.
7 Ma anamachọ ka madu nile di ka mu onwem di kwa. Otú ọ di, madu nile n'otù n'otù nwere onyinye-amara nke aka ha site na Chineke, otù onye otú a, onye ọzọ otú a kwa.
8 Ma asim ndi nānọghi n'ọnọdu di na nwunye na ndi di-ha nwuru, Ọ diri ha nma ma asi na ha nānọgide dika mu onwem nọ kwa.
9 Ma ọ buru na ha apughi ijide onwe-ha, ka ha luru: n'ihi na ilu di na nwunye ka ire ọku n'agu aru nma.
10 Ma enyem ndi nọ n'ọnọdu di na nwunye iwu, ọ bughi mu onwem, kama ọ bu Onye-nwe-ayi, Ka nwunye ghara ikewapu onwe-ya n'aru di-ya
11 (ma asi na ọ bu ezie na ọ kewapuru onwe-ya, ya nọgide nēnweghi di; ma ọ meghi otú a, ka eme ka ya na di-ya di n'otù); ka di ghara kwa irapu nwunye-ya.
12 Ma ọ bu mu onwem, ọ bughi Onye-nwe-ayi, nāsi ndi fọduru: Ọ buru na nwa-nna ọ bula nwere nwunye nēkweghi ekwe, ọ buru kwa na ọ di nwanyi ahu ezi nma ka ya na ya biri, ka di-ya ghara irapu ya.