7 N'ihi na unu onwe-unu matara otú unu nāghaghi iṅomi ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nādighi-agazi ije n'etiti unu;
8 ayi erighi kwa nri n'aka onye ọ bula n'efu, kama n'idọb͕u onye-ayi n'ọlu na ihuju-anya, nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu:
9 ọ bughi na ayi enweghi ike, ma ọ bu ka ayi we were onwe-ayi mere unu ihe-atù, ka unu we ṅomi ayi.
10 N'ihi na mb͕e ayi nọ n'etiti unu, ọ bu kwa nka ka ayi nēnye unu n'iwu, si, Ọ buru na onye ọ bula achọghi ilu ọlu, ya ghara kwa iri ihe.
11 N'ihi na ayi nuru okwu bayere ufọdu ndi nādighi-alu ọlu ọ bula, kama ha nētiye aka n'ọlu nke nābughi nke aka ha.
12 Ma ndi di otú a ka ayi nēnye iwu nāriọ kwa aririọ nime Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ka ha were nwayọ nālu ọlu, ri kwa nri nke aka ha.
13 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, ike agwula unu n'obi n'ime ihe ọma.