24 n'ihi na asim unu, na ọtutu ndi-amuma na ndi-eze chọrọ ihu ihe unu onwe-unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.
25 Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?
26 O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?
27 O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya site n'obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.
28 O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.
29 Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim?
30 Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.