10 N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere.
11 Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù?
12 Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi?
13 Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?
14 Ọ nāchupu kwa mọ ọjọ nke dara ob͕i. O we rue, mb͕e mọ ọjọ ahu putasiri, na onye-ob͕i ahu kwuru okwu; O we ju ìgwè madu nile anya.
15 Ma ufọdu nime ha siri, N'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.
16 Ndi ọzọ nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'ihi na ha nānwa Ya.