45 Ma otù onye nime ndi-iwu zara, si Ya, Onye-ozizí, n'ikwu okwu a I nēme kwa ayi ihe-ihere.
46 O we si, Ahuhu gādi-kwa-ra unu ndi-iwu; n'ihi na unu nēbo madu ibu di ike obubu, ma unu onwe-unu ejighi otù nime nkpisi-aka-unu kpatu ibu ahu.
47 Ahuhu gādiri unu; n'ihi na unu nēwu ebe anēlì ndi-amuma, ma nna-unu-hà b͕uru ha.
48 Ya mere unu bu ndi-àmà, ọlu nna-unu-hà di kwa unu ezi nma: n'ihi na ha onwe-ha b͕uru ha, ma unu onwe-unu nēwu ebe anēlì ha.
49 N'ihi nka amam-ihe Chineke kwu-kwa-ra, si, M'gēzigara ha ndi-amuma na ndi-ozi; ufọdu nime ha ka ha gēb͕u kwa sob͕u kwa;
50 ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n'aka ọb͕ọ a;
51 site n'ọbara Ebel rue ọbara Zakaraia, onye lara n'iyì n'ab͕ata ebe-ichu-àjà na ulo nsọ unu: e, asim unu, agāchọputa ya n'aka ọb͕ọ a.