30 N'ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà.
31 Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia.
32 Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.
33 Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.
34 N'ihi na ebe àkù-unu di, n'ebe ahu ka obi-unu gādi kwa.
35 Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;
36 unu onwe-unu, yikwara ndi nēche onye-nwe-ha, mb͕e ọ gēsi n'oriri ọlulu-nwunye laghachi; ka, mb͕e ọ gābia ku aka n'ọnu-uzọ, ka ha we meghere ya ngwa ngwa.