21 Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ.
22 Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:
23 sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ:
24 n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ.
25 Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú.
26 O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia.
27 O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n'ihi na ọ nara ya n'aru-ike.