3 Nēzenu onwe-unu: ọ buru na nwa-nna-gi emehie, bara ya nba; ọ buru kwa na ọ chègharia, b͕aghara ya.
4 Ọ buru kwa na o mehiere megide gi ub͕ò asa n'otù ubọchi, we chigharia ọzọ n'ebe i nọ ub͕ò asa, si, Echègharim; i gāb͕aghara ya.
5 Ndi-ozi-Ya we si Onye-nwe-ayi, Tukwasiri ayi okwukwe.
6 Onye-nwe-ayi we si, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi osisi sycamine nka, Ka eropu gi, ku kwa gi n'oké osimiri; ọ gāṅa kwa unu nti.
7 Ma ònye n'etiti unu, asi na o nwere orù nke nālu ọlu ubi ma-ọbu nke nāzù aturu, gāsi ya, mb͕e o si n'ubi bata n'ulo, Bia ngwa ngwa nọdu na nri;
8 nke nāgaghi-asi kwa ya kama nke ahu, Dozie ihe m'gēri na nri-anyasi, ke kwa ihe-ọkiké n'úkwù-gi, nējerem ozi, rue mb͕e m'risiri ṅu kwa; ma emesia gi onwe-gi gēri ṅu kwa?
9 Ọ̀ nwere ekele n'ebe orù ahu nọ n'ihi na ọ mere ihe akaworo àkà?