17 Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu.
18 Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya.
19 Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.
20 Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.
21 Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.
22 Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi
23 (dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi),