39 Mb͕e ha mezuru ihe nile nke di ka iwu Onye-nwe-ayi si di, ha we laghachi na Galili, rue obodo nke aka ha, bú Nazaret.
40 Nwatakiri ahu we nētó, nēsi kwa ike, nējuputa n'amam-ihe: amara Chineke di kwa n'aru Ya.
41 Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n'ememe ngabiga.
42 Mb͕e Ọ b͕ara arọ iri na abua, ha we rigo dika omume nke ememe ahu si di;
43 mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n'azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya;
44 ma ebe ha chère na Ọ di n'usu-ha, ha jere ije otù ubọchi; ha nachọ kwa Ya n'etiti ndi-ikwu-ha na ndi ha mara:
45 mb͕e ha nāchọtaghi Ya, ha we laghachi na Jerusalem, nāchọ Ya.