1 O we le anya n'elu, hu ndi-ọgaranya ka ha nātubà onyinye-ha n'ebe anēdebe ùtú anātu.
2 O we hu otù nwayi, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ka ọ nātubà n'ebe ahu ego ntà abua.
3 O we si, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕eye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ha nile:
4 n'ihi na ndia nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà n'onyinye: ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ihe nile o nwere nke o ji biri.