17 Ma ọ di ya nkpà irapuru ha otù onye-nkpọrọ n'ememe.
18 Ma ha nile tiri nkpu n'otù, si, Wepu Nwoke a, ma rapuru ayi Barabas:
19 onye atubàra n'ulo-nkpọrọ n'ihi otù nbili imegide ndi-isi ebiliri nime obodo ahu, ya na ib͕u-madu.
20 Pailat we gwa ha okwu ọzọ, ebe ọ nāchọ irapu Jisus;
21 ma ha tiri nkpu, si, Kpọgide Ya n'obe, kpọgide Ya n'obe.
22 O we si ha nke ub͕ò atọ, É-è, n'ìhi na Onye a mere ihe ọjọ gini? Ahughm ihe kwesiri inwu anwu n'aru Ya: ya mere m'gādọ Ya aka na nti, we rapu Ya.
23 Ma ha were oké olu rugide, nāriọ ka akpọgide Ya n'obe. Olu-ha we kari ya ike.