26 Mb͕e ha nēdupu Ya, ha we jide otù onye, bú Saimon, onye Sairini, nke si n'azu obodo ahu bia, ha we bokwasi ya obe-Ya, ka o buru ya so Jisus.
27 Oké ìgwè ndi-Ju nēso kwa Ya, ya na ìgwè ndinyom ndi nēti aka n'obi nākwa-kwa-ra Ya ákwá.
28 Ma Jisus chighariri n'ebe ha nọ, si, Umu-nwanyi Jerusalem, unu akwalaram ákwá, kama nākwaranu onwe-unu na umu-unu.
29 N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.
30 Mb͕e ahu ka ha gāmalite isi ugwu, Dakwasinu ayi; na isi ugwu ntà, Kpuchienu ayi.
31 N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?
32 Ma ndikom abua ọzọ, ndi nālu ọlu ọjọ, ka edukwara, Ya na ha, ka eb͕ue ha.