46 Mb͕e Jisus tisiri nkpu n'oké olu, Ọ si, Nna, n'aka-Gi ka M'nēnye mọm idebe: mb͕e O kwusiri nka, O we kubìe ume.
47 Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise huru ihe mere, o tobe Chineke, si, N'ezi-okwu Nwoke a bu onye ezi omume.
48 Ìgwè madu nile ndi zukọrọ n'ihe-nkiri a, mb͕e ha kirisiri ihe nile mere, ha we laghachi nēti aka n'obi-ha.
49 Ndi nile ndi mara Ya nke-ọma, na ndinyom ndi soro Ya site na Galili, guzokwara n'ebe di anya, nēle ihe ndia.
50 Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Josef, onye bu onye-nnọkọ-ikpé, ọ bu ezi nwoke buru kwa onye ezi omume,
51 (onye ahu ekweyeghi ìzù-ha na omume-ha), onye sitere n'Arimatia, otù obodo ndi-Ju, onye nēche ala-eze Chineke:
52 onye ahu jekuru Pailat, riọ aru Jisus.