5 Agēkpoju ndagwurugwu ọ bula,Agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala;Ebe di nb͕agọ gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi,Ebe nile di nkputankpu gābu kwa uzọ di lari;
6 Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.
7 Ya mere ọ si ìgwè madu ahu ndi biara ka ọ me ha baptism, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?
8 Ya mere mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu, unu amalite-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.
9 Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.
10 Ìgwè madu ahu we jua ya, si, Ọ̀ bu kwa gini kwesiri ka ayi me?
11 O we za, si ha, Onye nwere uwe-ime abua, ya me onye nēnweghi ka o keta; onye nwekwara nri, ya mee otú ahu.