16 O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.
17 Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si,
18 Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum.N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma:O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha,Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi,Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,
19 Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.
20 O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.
21 O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu.
22 Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?