40 Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.
41 Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n'ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n'ihi na ha matara na Ya bu Kraist.
42 Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n'ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ.
43 Ma Ọ siri ha, Aghaghm izì kwa obodo nile ọzọ ozi ọma ala-eze Chineke: n'ihi na eziterem ime nka.
44 O nēkwusa kwa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke Galili.