8 Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
9 O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'ebe a tuda Onwe-gi n'ala:
10 n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:
11 Ọzọ,Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.
12 Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.
13 Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.
14 Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu.