8 N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.
9 Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel.
10 Ndi ezitere we laghachi n'ulo-ya, hu ka aru di orù ahu nma.
11 O rue, mb͕e nwa oge gasiri, na Ọ garuru obodo anākpọ Nain; ndi nēso uzọ-Ya we so Ya ga, ha na oké ìgwè madu.
12 Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya.
13 Mb͕e Onye-nwe-ayi huru ya, O we nwe ọmiko n'aru ya, si ya, Akwala ákwá.
14 O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie.