50 Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ za ya, si, Atula egwu: kwere nání, agāzọputa kwa ya.
51 Ma mb͕e Ọ biaruru ulo ahu, O kweghi onye ọ bula so Ya ba, ma-ọbughi Pita, na Jọn, na Jemes, na nna nwata-nwayi ahu na nne-ya.
52 Ma madu nile nākwa ákwá, nēti kwa aka n'obi n'ihi ya: ma Ọ siri, Unu akwala ákwá; n'ihi na ọ nwughi anwu, kama ọ nāraru ura.
53 Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu.
54 Ma Ya onwe-ya jidere ya n'aka, we kpọ, si, Nwata-nwanyi, bilie.
55 Mọ-ya we lata, o wè bilie ngwa ngwa: O we si ka enye ya ihe-oriri.
56 Ibobo we nwubiga ndi muru ya ókè n'aru: ma O nyere ha iwu ka ha ghara igwa onye ọ bula ihe emereri.