6 Nkpuru ọzọ we da n'elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi ala miri.
7 Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha.
8 Nkpuru ọzọ we da n'ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.
9 Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu.
10 O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu.
11 Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke.
12 Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha.