3 O we si ha, Unu ewela ihe ọ bula n'ije-unu, unu ewela nkpa-n'aka, ma-ọbu àkpà, ma-ọbu ob͕e achicha, ma-ọbu ego; unu enwe-kwa-la uwe-ime abua.
4 Ulo ọ bula unu gābà, nọgidenu n'ebe ahu, si kwa n'ebe ahu pua.
5 Ka ha ra kwa, bú ndi nānaraghi unu nke-ọma, mb͕e unu nāpu n'obodo ahu tichapu ájá di n'ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.
6 Ha we pua, we nējezu obodo ntà ahu nile, nēzisa ozi ọma Ya, nēme kwa ka aru madu di ike n'ebe nile.
7 Ma Herod, bú tetrarch, nuru ihe nile emere: o we nēcheb͕u onwe-ya, n'ihi na ufọdu siri, na Jọn esiwori na ndi nwuru anwu bilie;
8 ufọdu si-kwa-ra, na Elaija aputawori ihè; ndi ọzọ si-kwa-ra na otù onye nime ndi-amuma ochie esiwori n'ọnwu bilie ọzọ.
9 Ma Herod siri, Mu onwem bipuru isi Jọn: ma ònye bu Onye a, Nke m'nānu ihe bayere Ya di otú a? O we nāchọ uzọ ihu Ya anya.