53 Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem.
54 Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha?
55 O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu.
56 N'ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n'iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n'obodo ntà ọzọ.
57 Mb͕e ha nāga n'uzọ, otù onye we si Ya, M'gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje.
58 Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.
59 O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam.