26 Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta.
27 Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.
28 Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu.
29 Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n'ulo-nzukọ ahu, ha we ba n'ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn.
30 Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:
31 O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi.
32 Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji