36 Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya;
37 ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi.
38 O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n'obodo nile so nka, ka M'kwusa kwa n'ebe ahu; n'ihi na ọ bu ime nka ka M'putara.
39 O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.
40 Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ocha.
41 O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha.
42 Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha.