38 O we si ha, Ka ayi ga ebe ọzọ n'obodo nile so nka, ka M'kwusa kwa n'ebe ahu; n'ihi na ọ bu ime nka ka M'putara.
39 O we ba n'ulo-nzukọ nile ha gazue na Galili dum, nēkwusa ozi ọma nāchupu kwa ndi-mọ ọjọ.
40 Onye-ekpenta we biakute Ya, nāriọ Ya, nēb͕u-kwa-ra Ya ikperè, nāsi kwa Ya, Ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ocha.
41 O we nwe ọmiko, setipu aka-Ya, metu ya, si ya, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha.
42 Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya, eme kwa ka ọ di ọcha.
43 O we dọ ya aka na nti nke-uku, we chupu ya ngwa ngwa,
44 si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu ọ bula: ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha nke Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.