38 Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem?
39 Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu:
40 ma inọdu n'aka-nrim ma-ọbu n'aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya.
41 Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn.
42 Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha.
43 Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:
44 ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile.