19 Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu.
20 Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu.
21 Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo.
22 Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke.
23 N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya.
24 Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu.
25 Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.